1Gbasapụ aka gị nʼinye onyinyenʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.2Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọnʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.3Mgbe eluigwe rujiri,mmiri ga-ezo;mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si agamaọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,onye mere ihe niile.6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,esepụkwala aka nʼanyasị,nʼihi na ị maghị nke ga-eto,maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,ha niile nwere ike too nke ọma.
Cheta Chineke nʼokorobịa gị
7Ìhè dị ụtọ,ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.8Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,ya ṅụrịa nʼime ihe niile,ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrịga-adị ọtụtụ.Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.9Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa.Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.Mee ihe niile ị chọrọ ime;gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.Kama, ghọtakwa nke a,na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.10Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.