1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye;Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.2Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ;ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ,ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.3Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike,meekwa ka ahụ dị ha mma.4Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere;gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”5Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide mna-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?”6Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m,ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu;mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya.7Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m;ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:8“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya;ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.”9Ọ bụladị ezigbo enyi m,onye m tụkwasịrị obi,onye mụ na ya na-eso erikọ nri m,ebiliela imegide m.10Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere,mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.11Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi,nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.12Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m,mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.13Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel,site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.Amen na Amen.