Abụ Ọma91ibo_bib

Chineke onye na-echebe anyị

1Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile eluga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.2Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”
3Nʼezie, ọ ga-anapụta gịsite nʼọnya nke onye osi ọnyana site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.4Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ,ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.5Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,6maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.7Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.8Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.
9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,10mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.11Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.12Ha ga-eji ọbụ aka ha,bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.13Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ,zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.
14“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru;aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.15Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya.Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya,aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.16Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,gosikwa ya nzọpụta m.”