1Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;2Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya,karịa ebe obibi niile nke Jekọb.3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị,O obodo Chineke; Sela4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn,dịka ndị na-asọpụrụ m,aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush,aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ”5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị,“A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya,ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”6Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ:“A mụrụ onye a na Zayọn.”7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị,“Isi iyi m niile dị na gị.”