1Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m,nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.2Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi;zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi.Ị bụ Chineke m;3meere m ebere, O Onyenwe m,nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.4Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m,ka m na-eweliri mkpụrụobi m.5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m;gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.7Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị,nʼihi na ị ga-aza m.8Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m;ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.9Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,fee gị ofufe, O Onyenwe anyị;ha ga-ebutere aha gị ebube.10Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;ọ bụ naanị gị bụ Chineke.11Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị,ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị;nye m obi na-adịghị agba abụọ,ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.12Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;i sitela nʼomimi nke dị alasite nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m.14O Chineke, ndị mpako na-emegide m;otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m,ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.16Chee m ihu, mekwaara m amara.Nye ohu gị ike gị,zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyịnʼihi na m na-ejere gị ozi.17Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị,ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme,nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.