Abụ Ọma80ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf.

Ekpere maka nnapụta

1Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel,gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ.Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim,nwupụta Ìhè2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.Kpọtee ịdị ike gị,bịa zọpụta anyị.
3O Chineke, kpọghachi anyị azụ,mee ka ihu gị nwukwasị anyị,ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
4O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niileruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụmegide ekpere ndị gị?5I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri;i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.6I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị,ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
7O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,mee ka ihu gị nwukwasị anyị,ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.9Ị sụchaara ya ala,mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.10Ndo ya kpuchiri ugwu niile,alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiriwasaakwa ume ya ruo osimiri.
12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niilesi otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya,ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ!Letakwa osisi vaịnị a,15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ,ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya;mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị,nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ;tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niilemee ka ihu gị nwukwasị anyị,ka e nwee ike zọpụta anyị.