1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!I meela ka ebube gị dị elunʼime eluigwe.2Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpandoi tinyere nʼọnọdụ ha,4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?5I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ,I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,8na nnụnụ niile,na azụ niile,na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.9O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.