1Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.2Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.3Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.4Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.5Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo,ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya ?”6Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,“Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!”Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.7Ma Chineke ga-agba ha àkụ,na mberede ka a ga-etida ha.8Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,mee ka ha laa nʼiyi;ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.9Mmadụ niile ga-atụ egwu,ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke,ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.10Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,ha ga-agbabakwa nʼime ya;ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.