Abụ Ọma63ibo_bib

Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda.

Onye ihe Chineke na-agụsị agụụ ike

1O Chineke, ị bụ Chineke m,e ji m obi m niile na-achọ gị;akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,anụ ahụ m na-achọsi gị ike,nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mbaebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị,hụkwa ike gị na ebube gị.3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ;aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị,ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m,ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ;aka nri gị na-ejigide m.
9A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi;ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.10A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi,ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.
11Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.