Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ.
Ekpere nke onye nọ na nsogbu
1Nụrụ akwa m, O Chineke,gee ntị nʼekpere m.2Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.3Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.4Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela5Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.6Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.7Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.8Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.