Abụ Ọma6ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?
4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?
6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.9Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.Ọ nabatala ekpere m.10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.