Abụ Ọma53ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid.

Nzuzu nke ndị na-emebi iwu

1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
2Chineke sitere nʼeluigwena-ele ụmụ mmadụ anya,ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,onye nke na-achọ Chineke.3Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,ha adịghị akpọkukwa Chineke.5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị.Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị;i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.
6O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!