Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.”
Ihe na-eche ndị ajọ omume
1Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike?Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi,gị onye Chineke na-eleda anya?2Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi;ọ dị ka agụba dị nkọ,gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.3Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma,ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela4O onye ire aghụghọ!Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.5Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi.Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela6Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu;ha ga-achị ya ọchị na-asị,7“Ugbu a, lee nwoke ahụ,onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya.Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu.O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”8Ma adị m ka osisi oliv,nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke.Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke,nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.9Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere;aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ.Olileanya m ga-adị nʼime aha gị,nʼihi na aha gị dị mma.