Abụ Ọma43ibo_bib
Arịrịọ maka enyemaka
1O Chineke, kpepụta m,kpechitere m ikpe mnʼebe mba na-amaghị Chineke nọ;gbapụta m site nʼakandị ajọ omume na ndị aghụghọ.2Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike.Gịnị mere i ji jụ m?Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ,nʼihi mmegbu nke onye iro?3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,ka ha duo m;ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,bụ ebe i bi.4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.Aga m eji ụbọ akwara too gị,O Chineke, bụ Chineke m.5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?Nwee olileanya na Chineke,nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,onye Nzọpụta m na Chineke m.No translations available.