Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ.
Chineke dị mma
1Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị;ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.3Soro m too Onyenwe anyị;ka anyị bulie aha ya elu.4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m,napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe;ihere adịghị eme ha.6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya;ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburuna-anapụtakwa ha.8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya,nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,13chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.14Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,chọọ udo ma gbasookwa ya.15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu,ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam.Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.21Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ;ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya;ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.