1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.7Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.8Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.9Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.10Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.14O sitere nʼebe obibi ya na-eleonye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,dịka olileanya anyị dị na gị.