Abụ Ọma32ibo_bib

Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil.

Nkwupụta na mgbaghara mmehie

1Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.2Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
3Mgbe m gbachiri nkịtị,ọkpụkpụ m rere uresite nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.4Ehihie niile na abalị niile,ị tara m ahụhụ,ume dị m nʼobi gwụchara,dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela
5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,kwụsịkwa izo ha ezo.Agwara m onwe m okwu sị,“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”Ị gbaghakwaara mikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekperemgbe e nwere ike ịchọta gị;nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,ọ gaghị erute ha.7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
8Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.9Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibunke na-enweghị akọnuche,nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.10Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
11Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.