Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.
Ekpere maka enyemaka
1O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela5Edinara m ala, hie ụra,ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,agaghị m atụ egwu ọbụla.7Bilie Onyenwe anyị!Zọpụta m Chineke m!Tie ndị iro m niile aka nʼagba;tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.8Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela