Abụ Ọma27ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Abụ nke iguzosi ike

1Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,onye ka m ga-atụ egwu ya?Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m aghaka ha ripịa anụ ahụ m,ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;ọ bụladị na agha adaa imegide m,nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyịụbọchị niile nke ndụ m,na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elukarịa ndị iro m gbara m gburugburu;aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.Meere m ebere, zaa m.8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.9Ezonarịla m ihu gị,agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.O Chineke, Onye nzọpụta m,ahapụkwala m.10Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,Onyenwe anyị ga-anabata m.11Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;duo m nʼụzọ kwesirinʼihi ndị na-akpagbu m.12Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha,ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m,ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
13Olileanya m bụ nke a:Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyịnʼala ndị dị ndụ.14Chere Onyenwe anyị;dịrị ike, nwekwaa ume,ma chere Onyenwe anyị.