Abụ Ọma2ibo_bib

Onye Chineke tere mmanụ

1Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo?Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?2Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha,ndị na-achị achị na-agbakọtakwaimegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.3Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyịma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”
4Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị.Onyenwe anyị na-akwa ha emo.5Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mbamee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.6“Mụ onwe m eguzobela m eze mna Zayọn, ugwu m dị nsọ.”7Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị:Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m;taa abụrụla m nna gị.8Rịọọ m,aga m enye gị mba niile nke ụwaka ha bụrụ ihe nketa gị.9Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha,tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”
10Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche;ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.11Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.12Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya,ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu.Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya.Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.