1Chebe m, O Chineke,nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m,e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”3Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”4Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a,maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.6Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;aga m anọkwa nʼudo.10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure.11I gosila m ụzọ ndụ;ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.