Abụ Ọma15ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Onye ga-ebi nʼugwu nsọ Onyenwe anyị?

1Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị?Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?
2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta,onye na-arụ ọrụ ezi omume,onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ,onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ,na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,4onye na-eleda onye ajọ omume anya,ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere,ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma,onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha.Onye na-eme ihe ndị aagaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.