1O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,ị makwaara m nke ọma2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;ị mazukwara ụzọ m niile.4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwutupu m kwuo ya.5Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,ị tụkwasịla m aka gị.6Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaanʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu maka nri gị ga-ejidesi m ike.11Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi mìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;abalị ga-enye ìhè dịka ehihie,nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;ọrụ gị niile dị ebube;amaara m nke a nke ọma.15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọmgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gịtupu otu nʼime ha adịrị.17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!Leekwa ka ha si dị ukwuu.18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala.Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.19O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!20Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.21O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?22Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.23O Chineke, nyochaa m, mara obi m.Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.24Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.