Abụ Ọma133ibo_bib

Abụ nrigo, nke Devid.

Ngọzị nke ibi nʼotu

1Lee ka o si bụrụ ihe dị mmana ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.3Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemonna-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.