1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị mmaọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyịugbu a na mgbe niile ebighị ebi.