Abụ Ọma129ibo_bib

Abụ nrigo.

Ekpere megide ndị iro Izrel

1Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,ka Izrel kwuo.2“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,ma ha enweghị ike merie m.3Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.4Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”
5Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asịbụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.6Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọnke na-akpọnwụ tupu o pupụta;7nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.8Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”