1Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụna-adọgbu onwe gị nʼọrụịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.4Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.5Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụonye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị irona-arụrịta ụka nʼama.