1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya,ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere,nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.4Nʼihi na nnagide anyị na-anagideịchị ọchị ndị nganga,na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.