Abụ Ọma122ibo_bib

Abụ nrigo, nke Devid.

Ekpere maka udo Jerusalem

1Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,“Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”2Ụkwụ anyị eguzola ugbu anʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.
3E wuru Jerusalem dịka obodoa chịkọtara ọnụ nke ọma.4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo,bụ ebo niile nke Onyenwe anyị,ịbụku aha Onyenwe anyị abụdịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị,bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.
6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem:“Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niilenchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m,ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”9Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị,aga m achọ ọganihu gị.