Abụ Ọma116ibo_bib

Chineke na-anapụta

1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.2Nʼihi na o gere m ntị,aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m;nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:“O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
7Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,anya m site na anya mmiri akwa,napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyịnʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,“Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”11nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyịnʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elukpọkuokwa aha Onyenwe anyị.14Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọmezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
15Ọnwụ nke ndị nsọ yadị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị;ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
17Aga m achụrụ gị aja ekelekpọkuokwa aha Onyenwe anyị.18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niileka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,19nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,nʼetiti gị, O Jerusalem.Toonu Onyenwe anyị.