Abụ Ọma113ibo_bib

Abụ otuto

1Toonu Onyenwe anyị!Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya.Toonu aha Onyenwe anyị.2Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzisite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.3Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya,aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.
4Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile,ebube ya dị elu karịa eluigwe.5Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị,onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,6onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasịeluigwe na ụwa anya?
7Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elusitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;8ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ,ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.9Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke yadịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi.Toonu Onyenwe anyị.