Abụ Ọma110ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na onye ya o tere mmanụ

1Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya:“Nọdụ ala nʼaka nri mruo mgbe m ga-eme ndị iro gịihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”
2Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ;ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha,ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gịdịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.
4Onyenwe anyị aṅụọla iyi,ọ gaghị agbanwe uche ya:“Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,nʼusoro Melkizedek.”
5Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.6Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.7Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.