1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu;ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu3na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ aghana-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.4O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,mmiri tokpukwara ugwu niile.7Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.8Ha sitere nʼelu ugwu niile,sọrọ gaa na ndagwurugwu,ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.9Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.11Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụbụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.12Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.13Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,ime ka nri site nʼala pupụta;15mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.16A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.17Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.18Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.19I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.20Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.21Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.22Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.23Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha.Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.25Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi,anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.26Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.27Ha niile na-adabere na gị,ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.28Ị na-enye ha nri;ha na-erikwa ya.Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,afọ na-eju ha nke ọma.29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,egwu na-eju ha obi.Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,a na-eke ha;ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,32onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.33Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.34Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.35Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ.Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m!Toonu Onyenwe anyị!