1Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama yajiri otuto baa nʼogige ya;keleenụ ya, tookwa aha ya.5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.