Abụ Ọma10ibo_bib

Arịrịọ maka ikpe ziri ezi

1Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
2Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.3Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.4Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ;ọ na-elelị ndị iro ya niile.6Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”
7Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.8Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ,na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.9Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye.Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.10Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,ọ na-azọpịakwa ha.11Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola.O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”
12Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.13Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya,“Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha.Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.15Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niilenke a na-apụghị ịchọpụta.
16Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.17O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,18Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,ka mmadụ efu, onye e kere eke,ghara imenye ha egwu ọzọ.