Abụ Ọma1ibo_bib
Onye ihe na-agara nke ọma
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehiemaọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.Ha dị ka igbugbo ọkanke oke ifufe na-efesasị.5Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.No translations available.