1Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.2Debe iwu m ka ị dị ndụ,chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.3Kee ha na mkpịsịaka gị,deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.4Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.5Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.6Nʼihi na otu ụbọchị,esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,7hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha,onye amamihe kọrọ,8ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọnʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,9nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,mgbe ọchịchịrị na-agbachi.10Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,were ihu nke ihere na-adịghị, sị:14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa,enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,lee gị ka ị na-abịa.16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọnnʼelu nʼihe ndina m.18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọo jeela njem dị anya.20O ji akpa ego juru gaa njem,abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.22O sooro nwanyị ahụ dịka ehia na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya,dịka ele nke na-aba nʼọnya,23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnyana-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,kama meekwanụ ihe m na-ekwu.25Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.26Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.27Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.