Ilu21ibo_bib
1Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị,nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya,ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.3Ime ezi omume na ihe ziri ezika Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọnke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru,dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.6Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide,ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.7Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma,ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi.8Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ,ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.9Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọkarịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.10Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ;ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere.11Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe,ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma.12Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anyana-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.13Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye,ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.14Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ,otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.15Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi,ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe.16Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe yaga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.17Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa;ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ.18Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume,onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi.19Ọ ka mma ibi nʼọzarakarịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.20Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya,ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya.21Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanyaga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.22Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike,kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha.23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ yana-egbochiri onwe ya ọdachi.24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya.Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụnʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa,ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị,nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.28Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi,ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi.29Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu,ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile.30O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla,nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.31E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha,maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.