Ilu15ibo_bib
1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;ma okwu ike na-akpali iwe.2Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.3Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile,anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;ma nkwutọ na-eweta ịda mba.5Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.6Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.8Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.9Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.10Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.11Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?12Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.13Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.14Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.15Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.16Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.18Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.20Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.21Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.22Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.23Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.24Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.25Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.26Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asịma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.27Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.28Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa yama ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.29Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso;ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.30Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.31Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụga-esoro ndị amamihe nọrọ.32Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asịma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.33Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.