Ilu10ibo_bib

1Ilu dị iche iche nke Solomọn:Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
3Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
6Onye ezi omume na-anata ngọzị,ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
7Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
8Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
9Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
10Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
11Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
15Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
16Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
17Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
18Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asịna onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
19Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsịma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
20Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
21Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
23Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
24Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
25Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
26Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
27Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
28Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
29Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
30A pụghị iwezuga onye ezi omume,ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.