Nehemaya12ibo_bib
Ndị nchụaja na ndị Livayị
1Ndị a bụ ndị nchụaja na ndị Livayị ndị so Zerubabel nwa Shealtiel na Jeshua lọta.Seraya, Jeremaya, Ezra,2Amaraya, Maluk, Hatush,3Shekanaya, Rehum, Meremot,4Ido, Gineton, Abija5Mijamin, Maadaya, Bilga,6Shemaya, Joiarib, Jedaya,7Salu, Amok, Hilkaya na Jedaya.
Ndị a niile bụ ndị ndu ndị nchụaja na ndị na-enyere ndị ndụ aka nʼụbọchị Jeshua.8Ndị Livayị so ha bụ ndị a: Jeshua, Binui, Kadmiel, Sherebaya, Juda nakwa Matanaya, onye ya na ndị otu ya na-elekọta ofufe ekele.9Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ.10Jeshua mụrụ Joiakim, Joiakim mụrụ Eliashib, Eliashib mụrụ Joiada,11Joiada mụrụ Jonatan, ebe Jonatan mụrụ Jadua.12Ndị a bụ ndịisi ikwu ndị nchụaja nʼoge ndụ Joiakim.
Meraia bụ onyeisi ụmụ Seraya, Hananaya bụ onyeisi ụmụ Jeremaya,13Meshulam bụ onyeisi ụmụ Ezra, Jehohanan, onyeisi ụmụ Amaraya;14Jonatan, onyeisi ụmụ Maluk; Josef bụ onyeisi ụmụ Shekanaya;15nke Harim, Adna, nke Meremot, Helkai;16Zekaraya, onyeisi ụmụ Ido; Meshulam, onyeisi ụmụ Gineton17Zikri, onyeisi ụmụ Abija; Piltai, onyeisi ụmụ Modaya na Miniamin18Shamua, onyeisi ụmụ Bilga, Jehonatan, onyeisi ụmụ Shemaya;19Matenai, onyeisi ụmụ Joiarib; Uzi, onyeisi ụmụ Jedaya;20Kalai, onyeisi ụmụ Salu; Eba, onyeisi ụmụ Amok,21Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya; Netanel, onyeisi ndị Jedaya.22E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.23E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ.24Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.25Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.26Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.