Nehum2ibo_bib

Ninive ga-ada

1Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị.Chee ebe gị niile e wusiri ike nche.Chee ụzọ niile nche,mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala.Chịkọtakwa ike gị niile.
2Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi,dịka ịma mma nke Izrelọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha,lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.
3Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara,ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie.Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụmanʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha,otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.4Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi,ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile.Ha na-enwu dịka ire ọkụ,na-agbagharịkwa dịka amụma.
5Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi,ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha.Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha,dozie ọta nche ha niile nʼusoro.6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,ụlọeze na-amakwa jijiji.7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo aaghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,na-etikwa aka nʼobi.8Ninive dịka ọdọ mmirinke mmiri ya na-ehifusị.“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe,ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.9Kwakọrọnụ ọlaọcha,kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha.Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ,enweghị ọgwụgwụ.10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji,anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
11Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a,bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri,ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị,na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?12Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya,nke na-anyagburu nne ọdụm anụ,na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile.Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.
13“Edoola m onwe m imegide gị,”otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri,“Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ,mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi.Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa.A gaghị anụkwaolu ndị ozi gị ọzọ.”