1Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.
Iwe Onyenwe anyị megide Ninive
2Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ.Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi.Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya,oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.3Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu,Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ.Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe,igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.Bashan na Kamel na-akpọnwụ,otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,ugwu nta niile na-agbazekwa,elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.7Onyenwe anyị dị mma.Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuugbuo ndị iro ya niile,ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyịọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe;nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.10Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu,ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu,ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.11Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta,bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị,na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.12Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,“Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ,ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga.Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ,ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.13Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu,tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”14Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive:“Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị.Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi,bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile.Aga m akwadokwa ili gị,nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”15Lee, nʼelu ugwu niileka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị,bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị!Mee mmemme gị niile gị Juda,mezukwaa nkwa niile i kwere.Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha,nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.