Maika1ibo_bib
1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile,gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime yaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu,bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.