Abụ Akwa5ibo_bib

1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼakanʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.8Ndị bụ ohu na-achị anyị.Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpamna-eweso anyị iwe nke ukwu.