Abụ Akwa4ibo_bib
1Lee ka ọlaedo si chuo echu.Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma.Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.2Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa,ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha,si dịrị ugbu a dịka ite ajanke ọkpụ ite kpụrụ.3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara haazụ ụmụ ha,ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere;ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ yanʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche ichetọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhienọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuukarịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mmakarịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọnʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebereji gbuo ụmụ ha, sie ha.Ụmụ ha ghọọrọ ha nrinʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè;ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ.O sunyela ọkụ na Zayọn,nke rechapụrụ ntọala ya niile.12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghịna ndị iro nwere ikesi nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya,ndị wụsiri ọbarandị ezi omume nọ nʼetiti ya.14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,dịka ndị kpuru ìsì.Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha.O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!”Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.Ọ gaghị agụnyekwa ha.Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anyamaka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị.Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị,tupu ọgwụgwụ anyị eruo.19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ikekarịa ugo na-efe na mbara eluigwe.Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ,ka ha jidere nʼọnya ha.Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya,nʼetiti mba dị iche iche.21Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,onye nke bi nʼala Uz.Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ.Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.22Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala;Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ.Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm,kpugheekwa ajọ omume gị niile.