Job36ibo_bib
1Elihu gara nʼihu sị:2“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gịna ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.3Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;aga m enye Onye kere m ezi omume.4Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.6Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.7Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ,kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,9ọ na-agwa ha ihe ha mere,na ha sitere na nganga ha mehie.10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.11Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.12Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.13“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.14Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.15Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.16“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.17Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.18Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.19Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gịka ị ghara ịnọ na mkpagbu?20Anọla na-echere ka abalị bịa,mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.21Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.22“E buliela Chineke elu nʼike ya,onye bụ onye ozizi dịka ya?23Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?24Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.25Mmadụ niile ahụzuola ya;ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.26Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.27“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.28Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime yamee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.29Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?30Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu yana-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.31Nke a bụ ụzọ o si achị mba niilena-enyejukwa ha nri afọ.32O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.33Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.