Job32ibo_bib
Okwu Elihu
1Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.2Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.3Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.4Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.5Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.6Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,ma unu bụ ndị okenye;ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,hapụ ịgwa unu ihe m maara.7Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.11Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,egere m ntị na ntụgharị uche unu,oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.12Egere m nnọọ unu ntị,ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.13Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’14Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.15“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;ike okwu agwụla ha.16M ga-echere, ugbu a ha deere duu,ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?17Mụ onwe m ga-ekwu uche m;ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,18nʼihi na okwu juru m ọnụ,ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.20Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.21Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegidemaọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.22Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.No translations available.