Job31ibo_bib
1“Mụ na anya m gbara ndụ kpebiena o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.2Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?3Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?5“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụghamaọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,6ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.7Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,ọ bụrụ anya m na-edu obi m,ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,8ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.9“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,10mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.12Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.13“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezinye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozimgbe ha nwere mkpesa megide m,14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?16“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,17ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,ma jụ inye ya ụmụ mgbei;18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,20ma obi ha agọzighị mnʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.23Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.24“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’25Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,26ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,27nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro mmaọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,30ekwebeghị m ka ọnụ m mehiemegide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’32Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)38“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,39ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,40ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.”Okwu Job agwụla.