1Job zara sị:2“Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ?Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?3Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m,ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?4A sịkwarị na m bụ onye mmehie,ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.5Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m,ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,6mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m,were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.7“Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata;ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.8Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe;o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.9O yipụla m ugwu m,wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.10Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara;ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.11Iwe ya dị ọkụ megide m;ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.12Ndị agha ya ji ike na-abịa;ha ewuola mgbidi were nnọchibido mha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.13“O meela ka ụmụnne mna ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.14Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m;ndị ezi enyi m niile echefuola m.15Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ;adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.16Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m,ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.17Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide;abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.18Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.19Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m20Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.21“Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,nʼihi na aka Chineke na-emegide m.22Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?23“Ọ gaara atọ m ụtọma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,24na e ji mkpisi igwe dee ha,maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.25Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.26Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.27Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya,mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ.Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!28“Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide yanʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’29unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha;nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha,mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”